Ọ bụ ezie na ndị ọzọ niile hapụrụ m, ị nọ ebe ahụ; ebe ndị ọzọ niile jụrụ m, ị nọ ebe ahụ; ị bụ onye nkwado m n'oge kachasị njọ ná ndụ m, oh... Mgbe m na-ata ahụhụ ma enweghị m ike inweta ihe m ga-eri, e mechiri ụzọ niile, anọ m n'ọchịchịrị kpamkpam, mgbe ahụ ị batara ná ndụ m. I wetara m ìhè gị, i mere ka ndụ m pụta ìhè, i gbanwee ndụ m. Ebe ndị mmadụ na-ekweghị na m, i kwere na m. Mgbe ndị mmadụ gwara m na ọ gwụla maka m, mana ị bịara mechie ọnụ ha niile... Chineke m, ị dị mma nye m, Jizọs, ị dị mma nye m.